Lesson Notes for Igbo Language JSS3 (Basic 9) Second Term
Access free Lesson notes for igbo Language JSS3 second term. View Basic 9 Igbo Lesson for 2nd Term.
Second Term Basic 9 Lesson Notes for Igbo Language JSS3
SECOND TERM E-LEARNING NOTES JS 3 (BASIC 9) IGBO LANGUAGE NTUPUTA IHE OMUMU (SCHEME OF WORK)
WEEK TOPIC
1 Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga
2-3 Akwukwo agumagu ahoputara: 1. Ogugu akwukwo ahoputara 2. Nkowa isi ihe akwukwo na- ekwu maka ya 3. Nkowa okwu ufodu di n’akwukwo 4. Agwa ufodu di n’akwukwo aguru 5. Uche umuaka banyere isi ihe aguru na agwa ufodu.
4-5. Nkebiokwu: 1. Ihe bu nkebiokwu 2. Nkebiokwu di iche iche di ka keaha, kekowaaha, kambuuzo, kenruaka 3. Mmebe ahiriokwu nwere nkebiokwu 4. Njirimara nkebiokwu
6. Akaoru: 1. Ihe bu akaoru 2. Udi akaoru di iche iche 3. Ozuzu maka aka oru 4. Uru akaoru bara
7-8. Nkebiahiri: 1. Ihe bu nkebiahiri 2. Nkebiahiri di iche iche 3. Ngosi nke
9-10 Ikwado na inye nwaanyi ikike na ohere di ka ndi nwoke:
1. Uzo di iche iche aga esi nye nwaanyi ohere
2. Etu aga e si kwado nwaanyi.
3 Ebe di iche iche nwaanyi nwere ike puta n’ochichi
4. Umunwaanyi ndi nweterela ezigbo onodu n’ochichi gomenti
11. Mmeghari
12. Ule
13. Mmechi
IZUUKA NKE MBU
UBOCHI…………………………….
ISIOKWU (Topic): Mmeghari (Revision)
IZUUKA NKE ABUO
UBOCHI……………………………..
ISIOKWU (Topic); AKWUKWO AGUMAGU A HOPUTARA
NDINISIOKWU
(i) Idepute usoro a na-agbaso mgbe a na-enyocha
akwukwo akuko(iduazi)
(ii) Igu akwukwo a hoputara
(iii) Ikowa isi ihe akwukwo na-ekwu maka ya
(iv) Ikowa ihe ufodu di n’akwukwo a guru
(v) Ikwu uche ha banyere ihe a guru na agwa ufodu
I)IDEPUTE USORO A NA-AGBASO MGBE A NA-ENYOCHA AKWUKWO AKUKO (IDUAZI)
NDINAYA
A na-agbaso usoro ndi a mgbe a na-enyocha akwukwo akuko na ejije
1 Aha akwukwo .
2 Aha onye dere ya
3 Afo na oge e jiri biputa ya bu akwukwo
4 Ebe ebu n’uche were dee ya bu akwukwo.
5 Ndi ebu n’uche were dee ya
6 Isiokwu di n’ime akwukwo ahu
7 Nchikota akuko
8 Nhazi
9 Agwa di na ya
10 Nka asusu
Uche onye ntule
NNWALE
i) Depute usoro ise a na-agbaso oge a na-enyocha akwukwo akuko(iduazi) ?
ii) Kowaa abuo n’ime ha.
IGU AKWUKWO A HOPUTARA
NDINAYA
I) Aha akwukwo na odee ya-.Aha akwukwo a ga-eleba anya bu Oke Soro Ngwere Maa Mmiri.O bu Maazi Isaac Udechukwu dere ya .E dere ya n’afo 1998.Ndi biputara ya bu Pacific publisher’s nke di n’Obosi Anambra steeti .
ii) Udi akwukwo- o bu iduazi ma burukwa akuko a roro aro.
iii) Ntoala Akwukwo –Akuko mere n’obodo a na-akpo Igboeze .Ndi ebu n’uche were dee ya bu ohaneeze.O bu banyere ihe na-eme n’oge ugbu a.
iv) Usoro akuko—Eji Igbo Izugbe were dee ya.E webatara olumba ole na ole
v) Isiokwu—Dika aha akwukwo a siri di,o dighi mma mmadu ime ihe n’ihi na o huru ndi ozo ka ha na-eme ya.
NNWALE
Kedu aha akwukwo a hoputara?
Kedu ihe bu isiokwu akwukwo a?
IKOWA ISI IHE AKWUKWO NA-EKWU MAKA YA
NDINAYA
Mazi udu na nwunye ya nwannediya mutara umu ato.Ha bu Ndidi, Ogeri na Ikechi. Ikechi bu nani nwoke .O no n’Onicha na nke nwanne nna ya agu akwukwo primari.N’ihi mkpamkpa ndi otu nzuzo na-akpa n’uloakwukwo di n’obodo mepere emepe,nna ya kpoghachiri ya azu n’ime obodo ha. O norozie n’ulo gutopu akwukwo primari baa koleeji.O guchaghi koleeji n’ihi na o tinyere isi n’otu nzuzo e wee gbara ya ugbo nwamkpi. O jere muo ka esi akwo ugboala.O kwokatara ugboala bido tuba mgbere anwuru ike .Ka o bu anwuru ike a alota Naijiria,aka kpaara ya.Ahuhu e nyere ya bu na a gbara ya ogwu ojoo si ya laba .O bu ogwu ahu a gbara ya ka o na-ariazi weenwuo.
NNWALE
Akwukwo a na-ako maka onye?
Kedu ihe gburu Ikechi?
ORU ULO
1.Aha akwukwo ogugu a guru bu——–(a)mmiri oku eji egbu mbe (b)nwa ngwii puo eze (c)oke soro ngwere maa mmiri (d)mbe di ogu.
2.Onye dere akwukwo ogugu a bu mazi———–(a)Onyekaonwu (b)Eze (c)Odilora (d)Udechukwu
3E dere ‘Oke Soro Ngwere Maa Mmiri ‘ n’afo ——–(a)1988 (d)1998 (c)2008 (d)
4Ikechi aguchaghi akwukwo n’ihe na——-(a)O nwuru anwu (b)O gara ala bekee(c)a churu ya achu (d)o nwere ego
5 Kedu ahuhu e nyere Ikechi—–(a)a gbara ya ogwu (b)e nyere ya ego (c)e tiri ya ihe (d)a turu ya mkporo.
TIORI
1.Kedu n’ulo akwukwo Ikechi guru akwukwo?
2.Onye bu Okorie?
IZUUKA NKE ATO
UBOCHI……………………………….
ISIOKWU(TOPIC) AKWUKWO AGUMAGU A HOPUTARA
NDINISIOKWU—-i) Ikowa ihe ufodu di n’akwukwo a guru(nhazi ya,
agwa putara ihe, omenaala di n’ime ya,asusu nka na ihe
mmuta di n’akwukwo a
ii) Ikwu uche ha banyere ihe a guru
IKOWA IHE UFODU DI N’AKWUKWO A GURU(NHAZI YA NA AGWA PUTARA IHE N’AKWUKWO A
NDINAYA
Maazi Udechukwu haziri akwukwo ya n’isi n’isi. O di isi iri na asaa dicha nke nke.E nwekwara ike isi etu a hazie ya
1 maazi Udu na Ezinaulo ya
2 Ikechi agaa Onicha biri
3 Ikechi aloghachi obodo ha
4 Ikechi abanye koleeji
5 A chupuru Ikechi n’ulo akwukwo n’ihi otu nzuzo.
6 Ikechi a buru onye okwo ugboala
7 Ikechi e jikere iga ala bekee ikpata ego
8 Ocho ihe ukwu anyara agba enyi
AGWA PUTARA IHE N’AKWUKWO A
NDINAYA
IKECHI
—O bu otu nwa nwoke.
O guru akwukwo n’Onicha.
O buuru onyeisi umu akwukwo.
O bu onye otu nzuzo.
O bu onye okwo ugboala.
O bu onye na-ere anwuru ike.
OKORIE
O bu onye iro Ikechi
O bu okoto mmabu
O bu olu ogu
O bu onye out nzuzo
O bu ya mere ihe Ikechi ejighi guchaa akwukwo
NNWALE
1)Depute agwa Ikechi?
2 Gosi uzo asato a haziri akwukwo a?
OMENAALA NA IHE NDI OZO YIRI HA.
NDINAYA
Omenaala ndi a ruturu aka n’akwukwo a bu oruugbo na azumaahia
ASUSU NKA
a)ILU—i)Ihe ikechi na-acho n’uko elu ka o huru n’uko ala (ihu akwukwo nke27)
ii) Okuko si na iwe anoghi ya n’obi banyere onye gburu ya kama na onye ya
na-ewere iwe bu onye jiri ya tee ofe.(ihu akwukwo nke36)
b)Akpaalaokwu–i)O doro ya anya na ndu ya nozi n’onu Odum(ihu akwukwo 26)
ii)—-ghotara na mmiri akariala gari (ihu akwukwo nke54).
IHE MMUTA DI N’AKWUKWO A
NDINAYA
1.Nne na nna ga- akpachapuru umu ha anya.
2.Mmadu kwesiri i na-agbara nsogbu oso
3.Anya ukwu adighi mma.
NNWALE
1.Depute ihe abuo i mutara n’akwukwo a.
2.Guo ihe ogugu di n’akwukwo arumaru n’ihu nke iri ano(40) ma zaa ajuju so ya.
ORU ULO
i) Otu n’ime ndi a bu nwanne Ikechi———-(a)Nwannediya (b)Ndidi (c)Okorie (d)Ngozi.
ii) Oke soro Ngwere maa mmiri bu akwukwo ———(a)iduazi (b)ejije(c)abu (d)egwuregwu.
iii) Kedu onye mere ihe Ikechi jiri banye otu nzuzo——(a)Udechi (b)Ogeri(c)Ndidi (d)Okorie.
iv) Aha nne Ikechi bu ———-(a)Ndidi (b)Ogeri (c)nwannediya (d)Ada.
v) Aha nna Ikechi bu mazi———(a)Udu (b)Eze (c)okorie ( d) Igwe.
TIORI
1.N’akuko a kedu onye bu Oke Sooro Ngwere Maa Mmiri?
2.Gini mere esemuokwu ji di n’etiti Okorie na Ikechi?
IZUUKA NKE ANO
UBOCHI……………………….
ISIOKWU (Topic) NKEBIOKWU( PHRASE)
NDINISIOKWU—1 IHE BU NKEBIOKWU
2 UDIDI YA DI ICHE ICHE
3.NGOSI AHIRIOKWU NWERE NKEBIOKWU
4.NJIRIMARA NKEBIOKWU.
1 IHE BU NKEBIOKWU
NDINAYA
Nkebiokwu bu okwu ole na ole gara n’ezigbo usoro nwere obere nghota mana nghota ya ezughi oke . O naghi enwe ngwaa.Ima atu
Ego nna m.
Uche na Obi.
Ji na ede.
NNWALE
Gini bu nkebiokwu?
Nye omumatu nkebiokwu?
2 UDIDI YA DI ICHE ICHE
NDINAYA
E nwere udidi nkebiokwu di iche iche n”asusu Igbo.Ha bu
Nkebiokwu keaha
Nkebiokwu kenkowa
Nkebiokwu kembuzo
Nkebiokwu nkenkwuwa
i).Nkebiokwu keaha—Nke a bu nkebiokwu eji aha na aha ezipute .Oge ufodu o buru aha na nnochiaha. ima atu
akwa okuko
akwukwo Uche
osisi oji
uwe ya
Uche na Obi
ii)Nkebiokwu kenkowa—Nke a na-abu aha na nkowa na esote .Ima atu,
Ewu ocha
Nwanyi ojii
Oche ogologo
Ube ojoo
iii)Nkebiokwu kembuzo—Nke a na-abu mbuzo na aha na esote.Ima atu
n’Aba
n’osisi
n’oche
na kano
na mmiri
iv)Nkebiokwu kenruaka—Nke a na-abu aha na nruaka na esote.Ima atu
Nwoke a
Ede ahu
Obi ahu
v)Nkebiokwu kenkwuwa—O bu nkejiasusu nkwuwa na eziputenke a.Ima atu,
Nwayoo nwayoo
Oso oso
Akuku akuku
Onwu onwu
NNWALE
i)Depute udidi nkebiokwu e nwere n’asusu Igbo?
ii)Nye omumatu nke o bula?
ORU ULO
1)Nkebiokwu kenruaka ebe a bu————(a)ji ocha (b)oso oso (c)n’elu (d)ube a
2)Otu n’ime ndi a bu udidi nkebiokwu——-(a)kengwaa (b)kemyiri (c)keaha (d)kenjiko
3)”Akuku akuku”,nke a bu omumatu nkebiokwu ——-(a)kenkwuwa (b)kenruaka(c)keaha (d)kembuzo
4)Nkebiokwu anaghi enwe otu n’ime ndi a——(a)aha (b)nkowaaha (c)ngwaa (d)nruaka.
5” N’Enugu”bu omumatu nkebiokwu —–(a)keaha (b)kenkowa (c)kembuzo (d)Kenkwuwa.
TIORI
Kaa nkebiokwu di n’ahiriokwu ndia ihe n’okpuru
1.Ndi a ka m choro.
2.Uchechi ojii tere ofe
3.O biara n’ulo m.
4.Eze na-aga nwayoo nwayoo.
5Igbe akwa ya mara mma.
IZUUKA NKE ISE (WEEK 5)
DATE……………………………
ISIOKWU—–NKEBIOKWU
NDINIISIOKWU(i) Ngosi ahiriokwu nwere nkebiokwu
(ii) Njirimara nkebiokwu
NGOSI AHIRIOKWU NWERE NKEBIOKWU
NDINAYA
A bia na ahiriokwu zuru oke nkebiokwu na ano n’isiahiri ma o bu na mmeju.Ima atu
ISIAHIRINGWAA MMEJU
Uche na Eze biara oso oso
Ji ahu di n’elu
Umu akwukwo chiri ochi ubochi ahu
Ndi enyi anyi kputara ewu ojii
Ha niile riri ji na agwa
Ewu ojii tara ede ya.
NNWALE
4.NJIRIMARA NKEBIOKWU
NDINAYA
O naghi enwe ngwaa .
Nghota ya anaghi ezu oke.
O ga-abu okwu abuo ma o bu karia mebere ya.
O ga-agbaso usorookwu .
NNWALE
Kanye ihe n’okpuru nkebiokwu di n’ahiriokwu ndi a;
i)Ulo akwukwo anyi mara mma.
ii)Obi gburu nchi asaa ndi ahu.
iii)Ji ahu mebiri emebi.
iv)Nwanyi ocha a tara azu nne ya.
ORU ULO
1)Kedu ebe nkebiokwu na- ano n’ahiriokwu?——–(a)n’etiti (b)nani n’isiahiri (c)nani na mmeju (d)n’isiahiri na mmeju .
2)Otu n’ime ndi a bu njirimara nkebiokwu——-(a)O na-enwe ngwaa (b)O na- eto eto (c)O na-ada uda (d)Nghota ya anaghi ezu oke.
Horo udi nkebiokwu ahiriokwu ndi a nwere,
3)”Ha siri ezigbo nri” (a)keaha (b)kenruaka (c)kembuzo (d)kenkowa
4)”Nri a agbaala uka” (a)keaha (b)kenruaka (c)kembuzo (d)kenkowa
5)”Nwanyi ocha mara mma” (a)kenruaka (b)kembuzo (c)kenkowa (d)keaha
TIORI
Were nkebiokwu ndi a mebe ahiriokwu—
1)Ebe ahu (2)n’ime abali (3)Onyenkuzi anyi (4)agwa ojoo (5) n’ike n’ike.
IZUUKA NKE ISII(WEEK 6)
UBOCHI……………………………….
ISIOKWU—AKAORU
NDIINISIOKWU—ihe bu akaoru
udi akaoru di iche iche
ozuzu n’akaoru
uru akaoru bara
IHE BU AKAORU
NDINAYA
Akaoru bu ihe mmadu na-eme wee na-enwete ego. A na-eji aka oru mmadu amata ya .Onye nwere aka oru nwere ihe kpatara o jiri horo oru ahu .O nwere ike buru na o na- enye ego karia oru ndi ozo ma o bu na o nwere ihunanya ebe oru ahu di ma o bu na ohanaeze na akwanyere ndi na-aru ya ugwu.Ufodu aka oru sitere n’agburu.Inwe akaoru na-eme ka mmadu nwee ego ma gbokwaa mkpa diiri ya.A na-ele onye enweghi akaoru anya di ka onyeohi ma o bu ofeogori.
NNWALE
1.Gini bu akaoru?
2.Depute ihe ato a na- ebu n’obi oge a na a horo aka oru?
UDIDI AKAORU
NDINAYA
Akaoru di uzo abuo .Ha bu,
a: akaoru nkeodinaala
b:akaoru ogbara ohuru
a; Akaoru nkeodinaala
Ndi a bu akaoru e nwere n’oge ochie.Ha di tupu ndi ocha abia n’ala anyi .Ha bu:
IKU AZU—FISHING
IKPU UZU —SMITTING
Igba nta—hunting
Ite nkwu—wine tapping
Itu ihe—carving
Oru ugbo —-farming
Ikpa anu—rearing of animals
Izu ahia—trading
sIkpu ihe—moulding
b;Akaoru ogbara ohuru
Ndi a bu ndi soro ndi ocha bia.Ndi Igbo amaghi maka ha na mbu. Ha bu ndi a
DIBIA BEKEE—MEDICAL DOCTOR
nkuzi— teaching
Idozi akpukpo ukwu
ikwa akwa—-tailoring
ikpu isi—-barbing
Ikpa isi—plaiting of hair
IPENTI IHE—PAINTING
ISE FOTO –PHOTOGRAPHING
IRUZI UGBOALA
NNWALE
1,Akaoru kere onwe ya uzo ole?
2,Depute akaoru ise e nwere n’oge ochie?
3,Gosi akaoru ise soro ndi ocha?
OZUZU N’AKAORU
NDINAYA
Akaoru bu ihe a na amu amu muta ya nke oma tupu e nwee ya.Onye choro imu akaoru ga- aga n’aka onye maara ya ka o kuziere ya akaoru ahu.O bu oru diiri nne na nna iziga umu ha ebe ha ga-amuta akaoru nke oge ochie. Oge ufodu,a naghi a naghi agba aka aga.A na-eji ego ma o bu oji ario onye ga-akuziri gi aka oru ahu.
Akaoru ogbara ohuru choro ima ka esi ede na ka esi agu.N’ihi nke a onye choro imuta akaoru nke ogbara ohuru ga- aguriri akwukwo di ka o kwesiri tupu o tozuo iru ya bu oru.E nweela ulo akwukwo ebe a na-azu umuakwukwo n’aka oru di iche iche.Ulo akwukwo ndi a bu,
Uloakwukwo nke Nkanauzu—-school of science and technology
Uloakwukwo ndi nkuzi—–teachers training college
Uloakwukwo ndi na-esi nri –catering school
Uloakwukwo ndi iwu—-law school.
Uloakwukwo ndi nche— police college. Dgz
NNWALE
- Kedu ihe onye choro akaoru oge ochie ga-eme tupu omuta ya?
- Depute ulo akwukwo ano ebe mmadu ga-amuta akaoru ogbara ohuru?
URU AKAORU BARA
NDINAYA
O na-enye ugwu
E ji ya amata akaraka mmadu
O na-eme ka mmadu nwee akunauba
O na-eme ka mmadu kwuru onwe ya.
O na-eme ka ime mpu laa
O na-akwalite asompi n’ihe onye maara eme.
O na-ewete aguu igu akwukwo.
NNWALE
1.Depute uru ise inwe akaoru bara?
2.Gosi uru ato ozo a na-enwete n’akaoru na-adighi ebe a?
ORU ULO
1.Otu n’ime ndi a abughi ezigbo akaoru——(a)nkuzi (b)izu ohi (c)ikpu isi (d)izu ahia
2.Akaoru kere onwe ya uzo ole?———-(a)abuo (b)ato (c)ano (d)ano
3.Otu n’ime ndi a bu akaoru e nwere n’oge ochie———(a)iwu (b)nkuzi (c)nchekwaba ego(d)iku azu
4.Kedu nke abughi njirimara akaoru?——–(a)o na-enye ego (b)o na-egbu mmadu (c)o na enye ugwu (d)o na-eme ka mpu laa.
5.Onye choro akaoru ogbara ohuru kwesiri—–(a)ikpota nne ya (b)iga akwukwo (c)I na-aruhu nani ura (d)I na-egwuri egwu.
TIORI
1.Depute akaoru ogbara ohuru ato I maara?
2.Gosi akaoru nke odinaala ato?
IZU NKE ASAA( week 7)
UBOCHI…………………………….
ISIOKWU—NKEBIAHIRI(CLAUSE)
NDINISIOKWU–i-IHE BU NKEBIAHIRI
II-NKEBIAHIRI DI ICHE ICHE
IHE BU NKEBIAHIRI
NDINAYA
Nkebiahiri bu okwu gara n’usoro, nwee ngwaa ma nghota ya ezughi oke.
Omumaatu-:
i-Nneka choro
ii-Mgbe o na-abia
iii-Okwu m kwuru
iv-Tupu enye m gi
v-Ebe o gbagara
NJIRIMARA NKEBIAHIRIOKWU:
i-O na-ano n’ahiriokwu.
ii-O naghi enwe nghota zuru oke.
iii-O nnaghi akwu nani ya.
iv-Nkebiahiri nwere ike ikpeazu, buru uzo ma o bu noro n’etiti n’ahiriokwu.
NNWALE
1.Gini bu nkebiahiri?
2.Were omumaatu gosi nkebiahiri ato?
3.Deputa njirimara nkebiahiri ano
NKEBIAHIRI DI ICHE ICHE
NDINAYA
E nwere nkebiahiri di iche iche na-aru oru di iche iche n’ahiriokwu.Ha bu:
1.Nkebiahiri keaha
2.Nkebiahiri kenkowaaha
3.Nkebiahiri Kenkwuwa
1.Nkebiahirikeaha:
Nke a bu nkebiahiri na-aru oru dika aha.O nwere ike ibu isiokwu ma o bu nnara n’ahiriokwu ya bu na o nwere ike ibido okwu ma o bu noro na mmechi okwu.
O bu eziokwu na nkebiahiri keaha nwere ngwaa mana nke a emeghi nghota ya zuo oke.
Omumaatu:
i- Ha amaghi ihe e kwuru
ii-O siri na aguu na-agu ya
iii- Akwa o bere meturu m n’obi
iv-Chinelo siri na ya na-abia
v-Akwa o tara di ya mma n’ahu
2.Nkebiahiri kenkowaaha:
Nke a na-akowa aha di n’ahiriokwu.O ga-ekwu udi ya na nke 0 bu.o na-aza ajuju kedu,nke,ma o bu,kedu udi.
omumaatu:
i-Onye ohi nke a gbajiri out aka anwuola
ii- Ewu nke di ime agbafuela
iii- Onye ruru ulo a bu enyi m
iv-Ule akwukwo nke e lere na taam a di mfe
v-Umuakwukwo ndi na-agba mbo ga- agafe n’ule
vi-O nyere m ego buru ibu
3.Nkebiahiri kenkwuwa
O bu nkebiahiri e ji nkwuwa emebe.
Omumaatu:
i-Amaghi m mgbe o biara
ii-O nuru mmiri ka o richara nri
iii-Ha kpere ekpere tupu ha ebido mmemme.
iv-O na-ekwu okwu ka onye amaghi ihe
v-Chijindu nwetara oru ozugbo o guchara akwukwo
NNWALE
1.Deputa udi nkebiahiriokwu ato e nwere?
2.Were omumaatu ato meputa nkebiahiriokwu abuo abuo n’udi nkebiahiri e nwere?
ORU ULO
1.Nkebiahiri bu?
(a)ahiriokwu gara n’usoro (b) okwu gara n’usoro, nwee ngwaa ma nghota ya ezughi oke.
(c)ahiriokwu nwere ngwaa (d)okara ahiriokwu
2.Otu n’ime ndi a esoghi na njirimara nkebiahiriokwu
(a)Anyi na-agu akwukwo(b) O na-ano n’ahiriokwu©O naghi enwe nghota zuru oke
(d)O naghi akwu nani ya.
3.Deputa udi nkebiahiri na nke a kara ihe n’okpuru
O siri nri toro uto
(a)Keaha (b)Kenkwuwa (c)Kenkowaaha (d)Keahiriokwu
4.——bu nkebiahiri na-aru oru dika aha
(a)Kenkwuwa(b)kengwaa(c)Keaha(d)Kenkowaaha
5.Udi nkebiahiri e nwere di…………..
(a)ano(b)out(c)ato(d)abuo
TIORI
1.Were omumaatu abuo abuo deputa nkebiahiriokwu n’udi ato ya.
2.Deputa njirimara nkebiahiri ato masiri gi
IZU NKE ASATO( week 8)
UBOCHI………………………………….
ISIOKWU—NKEBIAHIRI(CLAUSE)
NDINISIOKWU– NGOSI NKEBIAHIRI N’AHIRIOKWU
NGOSI NKEBIAHIRI N’AHIRIOKWU
NDINAYA
1.o bu ya nwee ugboala ahu.
2.O nwetara oru tupu o guchaa akwukwo.
3.ihe ahu okwuru bu asi.
4.A muru ya mgbe a na-alu agha.
5. Anyi ga-aga ulo uka.
6.I ga-akwu ugwo I ji.
7.Anyi na-echu mmiri maka echi.
8.Onye huru egonna.
9.Nne m na-arahu ura
10.Adaeze na umu ya kpere ekpere n’abali
NNWALE
A.Mee ahiriokwu ise nwere nkebiahiri ma kanye nkebiahiri ihe n’okpuru.
B.Deputa njirimara nkebiahiri ano.
ORU ULO
1. Otu n’ime ndi a bu njirimara nkebiahiriokwu
(a)Anyi na-agu akwukwo(b) O na-ano n’ahiriokwu(c)o nwere nghota zuru oke(d)a ga-eburiri uzo dee ya n’ahiriokwu
Bido na(2) rue (5),deputa udi nkebiahiriokwu di iche iche di n’ime ahiriokwu ya.
2.Onye o bula nuru mkpu o tiri
(a)kemburu(b)keaha(c)kenkwuwa(d)kenkowaaha
3.Onye ahu yi uwe mkpunaala
(a)keaha(b)kenkwuwa(c)kenkowaaha(d)kemburu
4.O dara m obi ozugbo o huru m
(a)kenkwuwa(b)keaha(c)kenkowaaha(d)kengwaa
5.Onye zatara ya nwetere ihe nrite
(a)kenkowaaha(b)kenkwuwa(c)keaha(d)onweghi
TIORI
1.Gini bu nkebiahiri?
2.Deputa udi nkebiahiriokwu ato e nwere.
IZUUKA NKE itoolu (WEEK 9)
Ubochi……………………………..
ISIOKWU: IKWADO NA INYE UMUNWAANYI IKIKE NA OHERE DI KA NDI NWOKE
NDINISIOKWU I-UZO DI ICHE ICHE A GA-ESI ENYE NWAANYI OHERE
II- ETU A GA-ESI KWADO NWAANYI
EBE DI ICHE ICHE UMUNWAANYI NWERE IKE IPUTA N’OCHICHI
UZO DI ICHE ICHE A GA-ESI ENYE NWAANYI OCHICHI
Joan of Arc
Joan of Arc is one of the greatest heroines in history. In 1429, at the age of 17, she helped France defeat England during the Hundred Years’ War. But she was later captured by the English and burned at the stake.
ARCHIV/Photo Researchers, Inc.
Microsoft ® Encarta ® 2009. © 1993-2008 Microsoft Corporation. All rights reserved.
NDINAYA
Uzo ndi ozo e nwere ike isi nye umunwaanyi nkwado bu ndi a:
1. A ga-ekeputa ministry ga na-ahu maka odimma umunwaanyi. e bidola nke a n’Naijiri
2. Ndi omebe iwu ga na- emebe iwu ga na- akwalite onodu umunwaanyi
3. A ga-enye umunwaayi ohere agumakwukwo n’efu
4. Govment no n’ochichi ga-akpolite umunwaanyi tozuru etozu nye ha okwa di ka minista, komishona dgz
5. Ulooro na-ahu maka nhoputa ga-akwusi ina umunwaanyi na- azo okwa ochichi ego iji gbata akwukwo.dgz
Ufodu okwa ndi a gunyere:
i. Okwa minista
ii. Okwa komishona
iii. Odeakwukwo okputorokpu na ministry
iv. Odeakwukwo na-ahu maka mmuta
v. Ndi isi n’ulooru mgbakwasi govmenti
vi. Ndi isioche komitii n’ulo okpako omebeiwu
vii. Ndi isioche otu boodu
viii. Ndi nlekota ochichi n’ime obodo e mebeghi nhoputa
NWALE
Deputa ebe ise e nwere ike inye umunwaanyi ohere
ETU AGA-E SI KWADO NWAANYI
NDINAYA
Anyi ga-eleba nke a anya site n’uzo abuo
1. N’ogo ezinaulo
2. N’ogo mpuga ezinaulo
1. N’ogo ezinaulo
N’ufodu ezinaulo, otutu umunwoke ka na-echi nwunye ha onu n’ala. Ha anaghi acho ka anu olu nwunye ha. nke a wee tinyezie umunwaanyi ufodun’onudu ohu. Nwaanyi o bula huru onwe ya n’onodu a anaghi aro nro nkwado na inye ikike. ya bu a ga- amaalite n’ezinaulo nyewe umunwaanyi nkwado na ikike site n’ime ihe ndi a:
i. Umunwoke ga na-ahu ndi nwunye ha n’anya
ii. Aga enye ha nsopuru ruru ha
iiI. Ha g-eso na-atuputa alo
iv. A ga na- eto mbo ha na-agba
v. Nwoke ga-eme ka nwunye ya nwee ntukwasa obi n’ebe o no dgz
2. N’ogo mpuga ezinaulo
A gbaala mbo di che iche iji hu na umunwaanyi welitere isi tumadi n’ebe ndorondoro ochichi di.
N’ afo 1995 umunwaayi mba uwa gbakoro na mba Chaina, n’obodo a na-akpo Beejin. Ha kpebiri n’ogbako a na a ga na-edobere ha opeka mpe okwa ato n’ime okwa iri o bula e keputara.
Uzo ndi ozo e nwere ike isi nye umunwaanyi nkwado bu ndi a:
1. A ga-ekeputa ministry ga na-ahu maka odimma umunwaanyi. e bidola nke a n’Naijiri
2. Ndi omebe iwu ga na- emebe iwu ga na- akwalite onodu umunwaanyi
3. A ga-enye umunwaayi ohere agumakwukwo n’efu
4. Govment no n’ochichi ga-akpolite umunwaanyi tozuru etozu nye ha okwa di ka minista, komishona dgz
5. Ulooro na-ahu maka nhoputa ga-akwusi ina umunwaanyi na- azo okwa ochichi ego iji gbata akwukwo.dgz
NWALE
1. Kedu uzo abuo e nwere ike isi kwado nwaanyi?
2. Kedu ebe umunwaanyi mba uwa no mee ogbako ha?
ORU ULO
1.Ufodu okwa ndi a bu nke agunyere umunwaanyi ma ewepu otu
(a). Okwa minista(b). Okwa komishona(c) . Odeakwukwo okputorokpu na ministry(d)okwa onye isi sineti
2.umunwoke kwesiri inye umunwaanyi out n’ime ohere ndi a n’ezinaulo
(a)ituputa aro ufodu(b)ikwusi nwoke itu aro(c)anaghi atu aro cha cha(d)itu egwu oge ufodu
3.otu n’ime ndi a bu iwu nwoke ebe nwunye ya no
(a)iti ya ihe(b)ihu ya n’anya(c)ikpo ya asi(d)igbagha ya
4.ihe nwere ike inye nwaanyi obi uto n’oru ezinulo bu?
(a)di ya igba nkiti n’oru ya (b)di ya iti ya ihe(c)di ya enyeghi ya nsopuru(d)nwoke ito nwaanyi n’oru ya n’ezinaulo
5. Ndi Govmenti kwesiri ikwado umunwanyi site n’ihe ndi a ma ewepu out
(a)Ndi omebe iwu ga na- emebe iwu ga na- akwalite onodu umunwaanyi(b) A ga-enye umunwaayi ohere agumakwukwo n’efu© Govment no n’ochichi ga-akpolite umunwaanyi tozuru etozu nye ha okwa di ka minista, komishona dgz(c)ha ekwesighi inye ha okwa n’ochichi ebe o bula nwoke no.
TIORI (ESSAY)
1.Kedu onodu abuo e kwesiri inye umunwanyi n’ezinulo?
2.Deputa onodu abuo e kwesiri inye nwaanyi na mpuga ezinulo
IZUUKA NKE IRI (WEEK 10)
UBOCHI……………………….
ISIOKWU: IKWADO NA INYE UMUNWAANYI IKIKE NA OHERE DI KA NDI NWOKE
NDINISIOKWU:i- EBE DI ICHE ICHE NWANYI NWERE IKE PUTA N’OCHICHI
ii-UMUNWANYI NDI NWETERALA EZIGBO ONODU N’OCHICHI
EBE DI ICHE ICHE NWANYI NWERE IKE PUTA N’OCHICHI
NDINAYA
Kemgbe e jiri mechaa ogbako umunwaayi ahu na mba Chaina, o burula iwu na otutu mba di iche iche na-aga na- ekekpuru umunwaanyi opekata mpe okwa naato n’ime uzo iri. Ebe mba Naijiria so binye aka na mkpebi a, govmenti na- ahukwa na umunwaanyi nwere ndi nnochite anya n’okwa niile a na-eke n’ala anyi. A na-eme nke a n’ogo govment etiti, nke steeti nakwa nke ime obodo.
Ufodu okwa ndi a gunyere:
i. Okwa minista
ii. Okwa komishona
iii. Odeakwukwo okputorokpu na ministry
iv. Odeakwukwo na-ahu maka mmuta
v. Ndi isi n’ulooru mgbakwasi govmenti
vi. Ndi isioche komitii n’ulo okpako omebeiwu
vii. Ndi isioche otu boodu
viii. Ndi nlekota ochichi n’ime obodo e mebeghi nhoputa
NWALE
Deputa ebe ise e nwere ike inye umunwaanyi ochichi
UMUNWANYI NDI NWETERALA EZIGBO ONODU N’OCHICHI
NDINAYA
PROF.DORA AKUNYILI
| UMUNWANYI NDI NWETERALA OKWA MINISTA | |||
| 1. | Ork.Obiageli Ezekwesili | Ngwuputaala gbara okpurukpu/agumakwukwo | |
| 2. | Prof.Dora Akunyili | Nzisa ozi na nzikorita ozi(onyeisi N.A.F.D.A.C.na mbu) | |
| 3. | Ork. Kema Chikwe | Njem ugboelu | |
| 4. | Ork.Ngozi oOkonjo Iweala | Ego(finance) | |
| 5. | Ork. Diezani Alison Madueke | Ngwuputa aku ime ala na ikpu igwe | |
| 6. | Ork. Helen Esuene | (minista Steeti)Ahuike | |
| 7. | Ork.Fatima Ibrahim | (minista Steeti)Ikike oku | |
| 8. | Ork.Aishatu Jibril Dukku | (minista Steeti)Agumakwukwo | |
| 9. | Ork.Akuabata Njoeze | (Minista Steeti)Orugbo na aku si na mmiri | |
| UMUNWANYI NDI OZO OKWA HA DI ELU | |||
| 1. | Okammuta Ndii Okereke Onyiuke | Onyeisi Naijiria Stock Ekschenji | |
| 2. | Ork.Farida Waziri | Onyeisi oche ulooru na-ahu maka mpu ego(E.F.C.C.) | |
| 3. | Ork. Oruremi Oyo | Onyeisi Ulooru na-ahu maka ntaakuko(N.A.N.) | |
| 4. | Dkt.ork. Ori Obasi | Komishona Maka ti) | |
| 4. | Dkt.ork. Ori Obasi | Komishona Maka Oruugbo(Abia steeti) | |
| 5. | Ork. Virgy Etiaba | Osote Govano(Anambra steeti) | |
ORU ULO
- Otu n’ime ndi a esoghi uzo e si enye umunwaanyi nkwado umunwaanyi (a) Aga enye ha nsopuru ruru ha (b) Ndi omebe iwu ga na- emebe iwu ga na- akwalite onodu umunwaanyi (c) A ga-enye umunwaayi ohere agumakwukwo n’efu (d) Ha agaghi-eso na-atuputa alo
- Umunwaayi mba uwa gbakoro na mba Chaina n’afo —— (a) 1996 (b) 1995 (c) 1991 (d) 1985
- Kedu nke na agunyeghi n’ebe e nwere ike inye nwaaanyi nnochiteanya (a) ibu igwe na-achi obodo onye isi (b) okwa minista (c) Okwa komishona (d)Odeakwukwo na-ahu maka mmuta
- E mere ogbako umunwaanyi na mba ——— (a) chile (b) kwara (c) Chaina (d)Legoosi
- Umunwaanyi kpebiri n’ogbako ha nwere na-aga na-edobere ha opeka mpe okwa ——– n’ime okwa iri o bula e keputara (a) ano (b) ato (c) ise (d) abuo
- ……………….bu out nwaanyi nweburu okwa onyeisi N.A.F.D.A.C. ma rukwa minista
(a)Ork.Obiageli Ezekwesili(b) Ork. Helen Esuene(c) Dkt.ork. Ori Obasi (d)Prof. Dora Akunyili
7.Osote Govano Anambra steeti bu………………………(a) Ork.Aishatu Jibril Dukku(b) Ork. Diezani Alison Madueke(c) Ork.Farida Waziri(d) Ork. Virgy Etiaba
TIORI
1.Deputa okwa abuo a guputaara umunwaanyi
2.Dee umunwaanyi ato no n’okwa minista na, abuo no na steeti.
IZUUKA NKE IRI NA OTU (WEEK 11) – Mmeghari
IZUUKA NKE IRI NA OTU (WEEK 12) – Ule
IZUUKA NKE IRI NA OTU (WEEK 13) – Mmechi






