Igbo Languague Second Term Examination Questions 2019/2020 Session – Junior Secondary School Two (JSS 2)
EDUDELIGHT GROUP OF SCHOOLS
1 BENSON AVENUE, LEKKI PHASE 1, LAGOS.
ULE TAAM NKE ABUO 2019/2020
SOBJEKITI: ASUSU IGBO OGE: AWA ABUO KLAASI: JSS 2
NKEJI NKE MBU: A GUO AZAA
GUO EDEREEDE A NKE OMA MA ZAA AJUJU SO YA
E nwere otu nwoke n’ obodo Umuohia, aha ya bu Nze Ozuomee. O luru umunwaanyi abuo. Aha nwunye ya nke mbu bu Akwaugo ebe nwunye nke abuo bu Ugodiya.
Umunwaanyi ya abuo ndi a bucha anyawu ututu. Akwaugo bu onye nkuzi ebe Ugodiya bu noosu n’ uloahuike di n’ obodo ha.
Akwaugo amutaghi nwa mana Ugodiya muru umu ato, otu nwoke na nwaanyi abuo. Aha nwa ya nwoke bu Uche, nke ada bu Ezidiugo ebe nke abuo bu Ezinne.
Nze Ozuomee huru Akwaugo n’ anya karia Ugodiya mana n’ ihi amutaghi nwa ya Ugodiya na umu ya choro ka Nze Ozuomee chulaa Akwaugo. Nke a butere nnukwu esemokwu n’ ezinaulo ha.
ZAA AJUJU NDI A (1-5)
- Olee aha nwunye nze Ozuomee nke abuo? (a) Adanne (b) Akwaugo (c) Ezidiugo (d) Ugodiya
- Kedu aha nwunye ya nke na-amutaghi nwa? (a) Ugodiya (b) Akwaugo (c) Ezidiugo (d) Ezinne
- N’ edereede a, ndi nwunye ya bu anyanwu ututu putara na ha— (a) joro njo (b) mara mma nke ukwuu (c) putara ka anyanwu (d) toro ogologo
- Umunwaanyi ole ka Nze Ozuomee luru? (a) ato (b) ano (c) abuo (d) ise
- Kedu nke abughi eziokwu n’ edereede a? (a) Aha nwa ya nwoke bu Uche (b) Akwaugo muru umu ato (c) E nwere esemokwu n’ ezinaulo ya (d) Umu ya choro ka achulaa Akwaugo
- Deputa onuogu ndi a na bekee puku iri, nari isii na asato (a) 10,068 (b) 10, 608 (c) 10,6008 (d) 16,608
- Hoputa nke abughi nkejiasusu e nwere n’ Igbo (a) Mkpoaha (b) Ngwaa (c) Nkwuwa
(d) Udaolu
8. Ukochukwu Okechukwu kwuru okwu chukwu n’ ulo Chukwu di n’ Arochukwu. Nke a bu — (a) akpaalaokwu (b) nsinuda (c) okwuntabiire (d) agwugwa
9. Aha ozo e nwere ike ejije bu (a) egwuregwu (b) agumagu (c) echimechi (d) agwugwa
10. Gini ka akaramkpu putara na bekee? (a) akaraajuju (b) apostrophe (c) comma (d) exclamation mark
11. Kedu akaraedemede na-egosi mgbe ahiriokwu kwusiri? (a) akarauhie (b) kpom (c) kpom rikom (d) rikom
12. Akara e ji ejiko enyemakangwaa na ngwaa n’ ahiriokwu bu akara—- (a) mkpuchi (b) kpom kpom (c) uhie (d) mkpu
13. Gini ka a na-akpo akara mkpuchi moobu akara ngudo na bekee? (a) bracket (b) colon (c) hyphen (d) semi-colon.
13. Kedu nke abughi akara edemede n’ ime ndi a? (a) akaramkpu (b) akarauhie (c) kedu (d) kpom.
14. Kedu ihe pronoun putara n’ olu Igbo? (a) aha (b) mkpoaha (c) ngwaa (d) nnochiaha
MKPARITAUKA:
Oriaku Uche: Nne chisom I biara ulouka?
Oriaku Uzoma: Eeh! Nne Adaku, I boola chi?
Oriaku Uche: Eeh nwanne m! kedu ka di gin a umu gi di?
Oriaku Uzoma: Ha dim ma. Kedu maka ezinaulo gi?
Oriaku Uche: Ha dicha mma. Abiara m n’ ulo gi ubochi satodee I noghi ya.
Oriaku Uzoma: Eee. Agara m ahia izuta eri isi.
Oriaku Uche: Gini mere nke mbu?
Oriaku Uzoma: Mmanu nri meturu ya.
Oriaku Uche: Ego ole ka I zuru nke ohuru?
Oriaku Uzoma: Azuru m ya out nari naira.
Oriaku uche: Onu ahia ya dim ma. Biko kedu ihe ukochukwu siri anyi weta ma anyi kpechaa ekpere?
Oriaku Uzoma: O siri anyi anyi wete : akwa, unere, osikapa na ji.
Oriaku Uche: Odi mma. Ka e mesia.
15. Kedu aha nwa Oriaku Uche? (a) Chisom (b) Uche (c) Uzoma (d) Adaku
16. Kedu ebe ha no kparia uka a? (a) n’ ahia (b) n’ ulouka (c) n’ ulo Oriaku Uzoma (d) n’ ulo Oriaku Uche
17. Kedu ubochi Oriake Uche gara n’ ulo Oriaku Uzoma? (a) Ubochi satodee (b) ubochi monde (c) ubochi orie (d) ubochi uka
18. Kedu aha nwa Oriaku Uzoma? (a) Adaku (b) Uzoma (c) Chisom (d) Uche
19. Kedu ebe Oriaku Uzoma gara? (a) ahia (b) uloogwu (c) odu ugboala (d) ulouka
20. Ego ole ka Oriaku Uzoma zuru eriri isi a? (a) naira iri (b) naira ise (c) nari naira abuo (d) otu nari naira
21. Gini mere eriisi nke mbu o zuru? (a) mmanu isi meturu ya (b) mmanu nri meturu ya (c) mmanu aki wuru ya (d) mmiri wuru ya
22. Ole nke esoghi n’ ihe ukochukwu siri ha weta? (a) akwa(egg) (b) unere (c) osikapa (d) akara
23. Kedu ihe ha gara ime n’ ulouka? (a) isa ulouka (b) ikpe ekpere (c) iwu ulo (d) isa efere
Mkaritauka a di n’ etiti mmadu. (a) ato (b) ano (c) abuo (d) isii
24. Ezi eze gbapuru ezi chuwa eze ,eze ezere ezi’ Nke a bu omumatu—- (a) akpaalaokwu (b) nsinuuda (c) ogharaokwu (d) okwuntabiire
25. Olee nke abughi njirimara agumagu ugbu a ebe a? (a) amaghhi onye cheputara ya (b) a mara onye cheputara ya (c) a na ede ya n’ akwukwo (d) o na akwu chim
26. Olee ihe one million putara one million putara n’ asusu igbo? (a) otu nari (b) otu puku (c) otu nde (c) otu ijeri
27. Ha na- esi nri. “Ha” n’ ahiriokwu a bu (a) aha (b) mbuuzo (c)nnochiaha (d) nkowa
28. Kedu ihe ugbooji putara n’ asusu bekee? (a) chalk (b) chalkboard (c) duster (d) pencil
29. Ezeaku zutara ewu n’ ahia taa. Olee nke bu ngwaa n’ ahiriokw a? (a) ahia (b) ewu (c) zutara (d) taa
30. Ole ihe one hundred and fifty putara n’ Igbo (a) otu nari na ise (b) otu nari iri ise (c) otu nari na iri ise (d) otu nari na ise ise.
31. Kedu nke abughi akuku ahu mmadu na ndi a? (a) ire (b) akpata (c) mkpisiaka (d) ola nti
32. Obi na Ada bu nwanne. Aha ole di n’ ahiriokwu a? (a) abuo (b) ato (c) ano (d) ise
33.Kedu nke bu akaoru ndi Igbo ebe a? (a) ikwa akwa (b) iko ugbo (c) ikpu uro (d) izu ahia
34. Kedu ihe akara mmagha putara n’ olu bekee? (a) hyphen (b) apostrophe (c) caret
(d) comma
35. Gini ka adverb putara n’ olu Igbo? (a) nkwuwa (b) nkowa (c) mkpu (d) aha
36. Nneka mara mma di egwu. Hoputa nke bu ahaaka na ndi a (a) di (b) egwu (c) mara (d) Nneka
37. Pronoun n’ Igbo putara—- (a) mbuuzo (b) ngwaa (c) nnochiaha (b) nkowaaha
38. Nzimozi mmadu cheputara n’ echiche moobu dee ya edee bu —- (a) agumagu (b) nkejiokwu (c) nkebiahiri (d) udaolu.
39. Ubochi ole di n’ izuuka ndi Igbo (a) iri (b) ato (c) ano (d) ise
40. Kedu aha onye dere akwukwo agumagu Ehi Na Enweghi Odudu Chi Ya Na Achuru Ya Ijiji. (a) Maazi Kenechukwu (b) Maazi Tagboo Nzeako (c) Maazi okpraji Nzeako (d) Maazi Obiano Obiekezie
NKEJI NKE ABUO
ZAA AJUJU ANO EBE A.
- Deputa aha ndi nwunye Maazi Udeozo na aha umu ha
1b. Kedu aha onye ichie diokpara Maazi Udeozo na nwanne ya nwoke gara kpesara ihe nna ha mere.
- Gini bu akara edemede?
2b. Deputa udi akara edemede ano imaara
- Deputa uzo ato ekere agumagu odinaala ma deputakwa ihe oputara n’ bekee.
3b. Deputa udi egwuregwu odinaala abuo imaara.
- Deputa nkejiasusu ndi a n’ olu bekee
i Nnochiaha ii Kwuwa iii Nkowaaha iv. Ngwaa v. Mbuuzo
- Gini bu otu nzuzo? 5b. Deputa udi otu nzuzo ato imaara




It is really helpful